Na Ala Umunze Be Anyi, Ihe Ndi a Bu Aru Na Ala Anyi Na Ebe Umu Nwanyi No

Obinwannem News Na Ala Umunze Be Anyi, Ihe Ndi a Bu Aru Na Ala Anyi Na Ebe Umu Nwanyi No

1, Na obodo Umunze nke di na okpuru ochichi ORUMBA SOUTH L.G.A.-Anambra, na obodo Biafra, O bu ihe aru nwanyi iri ukwu akwu ma-obu igbutu ya bu akwu

2, Iwa Orji : Iwa Orji bu nnukwu omenala ndi Igbo ji akpoku chi ha ma oburu na ha enwee ogbako ma obukwanu onye obia bia na ulo ha; oburu na obuputa ya bu orji gosia ofor di ya, O ga-aga n’iru waa ya bu Orji, tupuru ala ma nye ndi ichie nke ha, were oke nke ya, tupu were bunye onye obia ya, obughi oke na olu diara nwanyi, nwanyi waa ya bu orji, obu aru na ala Igbo.

3, Ikpa oke ala: Na ala anyi bu Umunze, obu nukwu ihe aru nwanyi itinye oke ala.

4, Ike nwanyi di: Okwesighi-ekwesi nwanyi ike nwa ya di; oburu na di ya anorozi ndu, O ga eje gwa umunne di ya ndi nwoke ka ha jiri aka ha kee ya bu nwanyi.

Mazi Onyema Chekwube Christian reporting, Obinwannem News

leave a reply

WP Radio
WP Radio
OFFLINE LIVE