Ụsụụ ndị agha 14 brigade, Ohafia, amalitela ihe omume golden Dawn 11

Obinwannem Igbo News Usuu ndi agha 14 brigade, ohafia amalitela ihe ọmụme golden dawn 11

Ụsụụ ndị agha, 14 BRIGADE dị n’Ohafia amalitela ihe omume akpọọrọ “GOLDEN DAWN 11” n’asụsụ bekee.

N’okwu ya n’oge ihe omume ahụ, ọchịagha 14 Brigade nke ụlọọrụ ndị agha ala anyị dị n’Ohafia, Brigadier General Adegoke Adetunji kwuru na ihe omume ahụ bụ ijị kwalite ogbe dị mma maka azụmahịa na mmekọrịta ihe gbasara akụ na ụba tinyere ibulite ọnọdụ nchekwa nke ndị na erube isi n’iwu na steeti a n’oge ntuliaka na oge ekeresimesi.

Brig. Gen. Adetunji garanihu kọwaa na ndị agha ala anyị na ụlọọrụ nchekwa iwu ndị ọzọ ga agbakọ aka n’ọkụ na ya bụ ihe omume, gbakwụnye na aga-anọ na Golden Dawn 11 ahụ Nye nlekọta ahụike n’efu maka obodo Amaekpu Ohafia, iji idi n’otu ndị agha na ndị obodo ahụ, ma masie ndị obodo ahụ na ndị ọbịa obi-ike banyere nchekwa tọrọ-atọ n’oge na Na ngwụcha oge ndị a.

Na mbụrị n’okwu ya, ezeọdịnala obodo Amaekpu Ohafia, Ezieogo Uduma Obuba Kalu, oge ọ na eto ndị agha maka maka nchekwa ha n’obodo ahụ, dụrụ ndị obodo ahụ ọdụ ka ha na-enyere ndị agha aka n’ọrụ nchekwa ha iji hụ na udo chịrị eze n’obodo ahụ.

Chief Chidi Onuoha | Obinwannem Igbo News | 24/10/2022

leave a reply

WP Radio
WP Radio
OFFLINE LIVE