Kanụ: obi iko n’elu dịka ụlọikpe okpesịa ọgwụ ga-anụ arịrịọ ụlọikpe okpesịa ọgwụ taa

Obinwannem Igbo News Kanụ: obi iko n'elu dịka ụlọikpe okpesịa ọgwụ ga-anụ arịrịọ ụlọikpe okpesịa ọgwụ taa

Anya niile ga-adị n’ụlọikpe okpesịa ọgwụ taa, dịka ụlọikpe ahụ ga-eleba anya n’akwụkwọ ikpe ahụ gọọmenti etiti gbara na-achọ ka akagbuo ikpe ahụ ụlọikpe mkpegharị chara nke tọhapụrụ maazị Nnamdi Kanu, bụ onye ndu otu IPOB.

Gọọmenti etiti na-ekwu na ndị ọkaiwu ụlọikpe mmadụ atọ mejọrọ n’ikpe ha chara, ebe ha lekwasịrị anya na nwuchi anwuchiri Kanu na Kenya iji chaa ikpe ahụ n’elebaghị anya na mbọmbọ o riri oge atọhapụrụ ya n’afọ 2017.

Gọọmenti na-ekwu na ndị ọkaiwu ndị añụjughi mmiri ara afọ n’ikpe ahụ ha chara site n’ịkachapụ akwụkwọ ndị agbara megide onye ndu otu IPOB, maazi Nnamdi Kanu, na-ekwu na ha etozughi oke ileba ikpe ahụ anya.

IPOB agwala ọchịchị etiti ka o rube isi n’ikpe ahụ ụlọikpe mkpegharị chara n’abalị iri na atọ nke ọnwa iri. Kaosiladị, otu ahụ ekwuola na ya dị na njikere izute gọọmenti n’ụlọikpe okpesịa ọgwụ taa.

Chief Chidi Onuoha | Obinwannem Igbo News | 24/10/2022

leave a reply

WP Radio
WP Radio
OFFLINE LIVE