Ụlọọrụ ndị uweojii akpọọla oku ka enwee njikọ aka n’ọrụ nchekwa

Obinwannem Igbo News Ụlọọrụ ndị uweojii akpọọla oku ka enwee njikọ aka n'ọrụ nchekwa

Akọwaala njikọ aka ndị obodo na ndi ọrụ nchekwa IWU dịka otu n’ime ụzọ ndị ejị eme ka nchekwa bụrụ ịgba n’Abia steeti.

Ọnụ n’ekwuchitere ndi uweojii n’Abia steeti, bụ maazị Geoffrey Ogbonna, mere k’amata nke a Oge onye ntakụkọ Obinwannem na ajụ ya ajụjụ n’Umuahi.

O kwuru na ihiwe ọtụ nche obodo na inye ndị ọrụ nchekwa iwu ozi ndị bara uru bụ otu n’ime ụzọ ndị esi echekwa ndụ na ngwongwo ndị bi na steeti a.

Maazị Ogbonna gbarụrụ ihu n’ogo agwa omekome juputara n’obodo ma kpọọ oku ka abanye n’ime ọhịa ndị dịcha n’obodo dị iche iche Ijị chọpụta ndị omekome ndị nwere ike izo n’ime ọhịa ndị a na akpa nkata ime arụ.

Ọ gwara ndị nne na nna ka ha nwee anya nkọ n’ebe ụmụ ha nọ ma gwa ndị bi na steeti a ka ha kee nkwụcha ma zigara ndị ọrụ nchekwa iwu ozi n’oge iji nwee ike zaghachi ngwangwa.

Chief Chidi Onuoha | Obinwannem Igbo News | 25/10/2022

leave a reply

WP Radio
WP Radio
OFFLINE LIVE