Ulooru DSS agwala ndi ala anyị ka ha kee nkwụcha

Obinwannem News Ulooru DSS agwala ndi ala anyị ka ha kee nkwụcha

Ụlọọrụ DSS akpọọla oku ka enwee ịda jụụ dịka ya na otu nchekwa iwu ndị ọzọ na arụsi ọrụ Ike ime ka enwee ịda jụụ n’ime na mpụga Abuja.

Mba America na Britain nọọrọ na sọndee dọọ aka na nti na enwere ike inwe mwakpo n’Abuja, na-achọ imebisi ụlọọrụ gọmeenti, ụlọụka, ụlọakwụkwọ na ebe ndị ọzọ ha.

Nke a emeela ka enwee obi iko n’elu na FCT na steeti ndị gbara ya gburugburu. Ọnụ n’ekwuchitere DSS, Peter Afunanya, kwuru na onye ọbụla ga amụrụ anya ka azụ ma nyere ndị ọrụ nchekwa iwu aka n’ozi ndị ahụ dị mkpa.

Chief Chidi Onuoha | Obinwannem Igbo News | 25/10/2022

leave a reply

WP Radio
WP Radio
OFFLINE LIVE