Onye ọ bụla hụrụ anyị si na ya ahuruo anyị ga ekpu isi

Obinwannem World News Asusu Igbo ga adi nuru ngbe ebiebi

Ọfọ mụ na ago na isi ụmụ obodo niile, bụ ọfọ ogologo ndụ na ahụ ike, njọ na iru anyị na azụ.

Asị kwa m na anyị ga adị ka echi maka na echi adịghị agwụ agwụ. Asị m na ihe anyị ga eri bụ ihe bụ ihe anyị ga ahụ, ma na nke ga eri anyị ama mbia. Onye si na ịsị anyị na awa na àjà ya woro nke ya chụọ, asị m na opupu na mba taa anyị ga a bụ ije awere.

Onye ọ bụla hụrụ anyị si na ya ahuruo anyị ga ekpu isi. Asim na anyị gbuo ná iru na azụ, aka nri ma aka ekpe na ọ bụ ihe ọma ka anyị ga egbute. Asị m na ọ ga adịrị anyị na mma na Eke, Orie, Afor na Nkwo site na aha ndị mbụ na ndị egede, ichie ụkwụ na ichie nta, ndị ọkpụ ma ndị ọkpụ tọrọ ọkpụ, Chi ụwa m bụ Ogbodo Ede, Arọ bi na agụ,

Arochukwu, nri, ọgụgụ na ụdọ, ikenga, uvudike na eri ebini, elu na ala eze nwaanyị bi na mmiri, Nne m Chukwu eke idemmiri, agbara nwoke ma agbara nwaanyị, ikuku, anyanwụ, ọnwa na kpakpando, Amadioha, mmụọ niile so anyị were bịa ụwa na aha Chukwu Okike Abiama pụrụ ime ihe niile. isee Isee iseee iseee.

Ọ ka bụ kwa nwanne unu nwoke Mazi Nnamani Chimezie nwa afọr nke a na etu OSE ỌJỊ.

leave a reply

WP Radio
WP Radio
OFFLINE LIVE