Ndị omeiwu, Orji Uzor Kalu, Abaribe, Theodore Orji na ndi ọzọ Akpọ ọla ọkụ ka atọ hapụ Nnamdi Kanu

Obinwannem News Ndị omeiwu, Orji Uzor Kalu, Abaribe, Theodore Orji na ndi ọzọ Akpọ ọla ọkụ ka atọ hapụ Nnamdi Kanu

Ndị omeiwu si mpaghara S’east n’ụlọ nzukọ omeiwu ukwu ala anyị nọọrọ na tọọdee gwa gọọmenti etiti ka o rube isi n’ikpe ahụ ụlọ ikpe mkpegharị chara ma nye iwu ka atọhapụ onye ndu otu IPOB, maazị Nnamdi Kanu n’egbughi oge ọbụla.

Otu ahụ sitere n’ozi ha weputara n’Abuja dụọ ọchịchị etiti ọdụ ka ọ ghara ịgawa n’ụlọikpe okpesịa ọgwụ, kama, ka owere ohere ikpe ahụ a chara iji gboo nsogbu a nọrọla ọtụtụ oge maka ọdịmma, Udo na idi n’otu nke ala anyị.

Ha mere k’amata na ịga n’ụlọikpe okpesịa ọgwụ nwere ike ikpalite iwe nke ga akụsasị udo na mbikọrịta nke ndị ala anyị.

Ndị omeiwu ahụ gwara onyeisiala ka o cheta nkwa o kwere ndị okenye si ala Igbo n’oge garaga ma tọhapụ Nnamdi Kanu, tụmadị, ugbua ụlọikpe mkpegharị merela ka ya bụ okwu dị mfe.

Ndị omeiwu ndị ahụ gụnyere:
Senator Orji Uzor Kalu (chief whip)
Senator Chukwuka Utazi (majority whip)
Senator Enyinnaya Abaribe
Senator Uche Ekwunife
Senator Stella Oduah
Senator Sam Egwu
Senator Obinna Ogba
Senator Theodore Orji
Senator Chimaraoke Nnamani
Senator Michael Nnachi
Senator Onyewuchi Ezenwa
Senator Rochas Okorocha
Senator Frank Ibezim
Senator Patrick Ifeanyi Uba.

Abụ m Chief Chidi Onuoha. Obinwannem Igbo News 21/10/2022

leave a reply

WP Radio
WP Radio
OFFLINE LIVE