Akabachị Abia steeti nọọrọ n’anyasị mọọndee chụọ ndị enyemaka ya niile. Ozi sitere n’aka odeakwụkwọ gọmeenti, Barr Chris Ezem mere k’amata na ndị a niile ga akwụsị ọrụ n’egbughi Oge.
Emeghi K’amata ihe kpatara ejiri kposaa ha. Aga-echeta na n’abalị iri na anọ nke ọnwa Dec 2021, gọvanọ kposara ndị ọrụ enyemaka ya ma họpụta ndị ọhụrụ na mmalite afọ 2022, bụ ndị ekposara ugbua.
Ana atụ anya ịhọpụta ndị ọhụrụ tupu afọa akụrụ ọnụ
Chief Chidi Onuoha | Obinwannem Igbo News | 25/10/2022