Abia State enwetala kọmishọna ọhụrụ nke ndị uweojii

Obinwannem Igbo News Abia State enwetala kọmishọna ọhụrụ nke ndị uweojii

Kọmịshọna ọhụrụ awụchaala n’isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Abia steeti. Ana ya bụ CP Mustapha Mohammed Bala.

Ọ nọchiri anya onye buburu CP, buzi AIG Janet Agbede, onye ezigara na police staff college, dị na Jos, plateau Steeti dịka Commandant ọhụrụ.

AIG Agbede bụ n’ime ndị uweojii narị anọ iri isii na ise ndị IGP Usman Alkali Baba buliri n’ọkwa na nsọ a.

IGP zipụrụ ndị AIG iri na anọ na ndị kọmishọna iri anọ na anọ n’ogige na ụlọọrụ ndị uweojii dị iche iche n’ala anyị iji weta nchekwa tọrọatọ. Ọnụ n’ekwuchitere ndị uweojii, Olumuyiwa Adejobi kwuru nke a n’ozi owepụtara.

Chief Chidi Onuoha | Obinwannem Igbo News | 26/10/2022

leave a reply

WP Radio
WP Radio
OFFLINE LIVE